Ndị ọkwọ ụgbọala abụọ mebiri mbọ izu ohi na ịtọrọ mmadụ n'Abịa steeti

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọkwọ ụgbọala abụọ mebiri mbọ ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị omempụ gbara iji ezu ndị njem ohi ma tọrọkwa ụfọdụ n’ime ha n’okporoụzọ si Aba gawa Ụmụahịa n’Abịa steeti.
Akụkọ ruru ụlọ mgbasa ozi BBC ntị kwuru na òtù ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị omempụ banyere n’ụgbọala Kosta bọs si Aba na-aga isi obodo Ụmụahịa oge ndị njem abụọ malitere ịgwa onye ọkwọ ụgbọala ka ọ kwụsị ha na mpaghara ebe a ma ama dịka ebe ndị omekome na-akpa nkpankpa na steeti ahụ.
Onye ọkwọ ụgbọala ahụ jụrụ ịkwụsị ebe ahụ nke mere ka ndị omempụ ahụ malitekwa iyi ya egwu ma kwuo na ha “ga-agbapụ isi ya" ma ọ bụrụ na ọ kwụsịghị ebe ahụ, dịka etu onyeisi otu Cooperative Transport Union nke Abịa Steeti Chukwuma Azode, siri kọwaa.
Azode kwuru na onye ọkwọ ụgbọala ahụ nwere obi isi ike ma buru ụgbọala ahụ gbaa oke ọsọ, tupu o rute ebe ndịagha Naịjirịa na-eme nnyocha n’Isialangwa nwere kwụsị ma kpọọ ndịagha oku enyemaka.
“Nke a mere ka ndịagha malite nnyocha tupu ha were chọpụta na ndị ahụ a na-enyo enyo bu egbe na ngwaagha dị iche iche n’ime ụgbọala ahụ,” Azode kwuru.
O kwuru na onye ọkwọ ụgbọala ahụ gwara onye ọkwọ ụgbọala na-eso ya n’azụ ka ọ ghara ịkwụsị ebe ọ bụla kama ka ọ gbara bịa ebe ndịagha na-eme nnoycha n’Isialangwa.
“Mgbe onye ọkwọ ụgbọala nke abụọ rutere ebe ahụ, ndịagha nnyochara ụgbọala ya ma chọpụtakwa na ndị ọzọ bukwa egbe na ngwaagha ndị ọzọ n’ime ụgbọala ahụ.”
O kwuru na nke a mere ka ndịagha nwụchie mmadụ isi a na-enyo enyo dịka ndị ojiegbe emempụ.
Ndị ọchịchị kwuru na ndị ahụ a nwụchiri nọ n'aka ndịagha ugbua dịka nnyocha na-aga n'ihu iji mata ọrụ ha niile.