"Ụmụnwoke chịrịla Anambra Steeti achịtaghị aja, ugbua bụ ohere nwaanyị" ịchị - Chioma Ifemeludike

Aha onyonyo, Umunwoke chịrịla Anambara enweghị ihe ha chịtara, hapụnụ ka nwaanyị gaa -Chioma Ifemeludike
"Ụmụnwoke chịrịla Anambra Steeti achịtaghị aja, ugbua bụ ohere nwaanyị" ịchị - Chioma Ifemeludike
  • Onye dere ya, Uche Akolisa & Donald wogu
  • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist & Video Journalist

Chioma Ifemeludike bụ nwada ji ọkọlọtọ pati African Action Congress (AAC) bụ pati Omoyele Sowore hiwere azọ ọkwa gọvanọ Anambra Steeti n'ọnwa Nọvemba, 2025 akatọọla ọchịchị ụmụnwoke ndị chịrịla steeti ahụ kamgbe ọtụtụ afọ.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Ifemeludike bu naanị nwaanyị so na ndị na-azọ ọkwa ahụ kwuru na ụmụnwoke chịrịla steeti ahụ achịtaghị aja, ya mere o ji ekwu ka ụmụnwoke nye ohere ka nwaanyị chịa ka ndị Anambara mata nke ka mma.

Nwaada ahụ bụ onye na-alụ ọgụ maka ikike dịịrị onye gbarụrụ ihu maka ọnọdụ nchekwa, "Nke bụ nke na-agbawazị m obi, gbawa ndị obodo obi ha ji sị m pụta bụ na i lee anya n'Anambra steeti n'afọ atọ gara aga, ị ga-achọpụta na ọtụtụ mmadụ anwụọla, ma ndị a tọọrọ atọrọ, ma ndị a gbagburu agbagbu, ma ndị e megburu emegbu, ma ndị agụụ na-egbu.

"Ọ bụrụ na onye kwesịrị ịhụ na e chekwara ndụ anyị ka ọ ghara iwufu, lepuru anya n'ihe mbụ o kwesịrị imere obodo, ị maara na ihe emebiela."

Ọ katọkwara etu ntuliaka nakwa ndọrọndọrọ ọchịchị Okpuruọchịchị si aga n'Anambra sị, "E nwere ndị nọ n'Okpuruọchịchị m bụ Idemili-North, ndi na-agwa m na ntuliaka Okpuruọchịchị e mere abụghị ntuliaka kwụụ ọtọ, na e dere mpụtara ntuliaka ede, na iwe na-ewe ha.

"Ihe dịka Okpuruọchịchị abụghị ihe e ji egwu egwu. Ndị ga-eme na nketa oke dị n'ọchịchị onyekwuoucheya ga-erute ndị obodo aka bụ Ọkpuruọchịchị. I were ya ị ga-nye ndị masịrị gị, ị bịa ị sị m na ị na-arụ ọrụ. O nweghị ihe ị na-arụ. Hapụ ndị ime obodo ka ha were aka ha họpụta onye ga-achị ha."

N'okwu ihe o jiri họrọ pati AAC, ọ sịrị, "Ọ bụkwanụ maka na anyị nọzị ala na-ekiri, a sị na ụwa na-emebi maka na ndị ezigbo mmadụ nọ n'akụkụ na-ekiri ndị ajọ mmadụ. M wee legharịa anya sị kedụkwanụ pati m ga-anọ, maka na abụ m ụdị mmadụ agaghị anọnwu ebe a ga-ewere ego a ga-eji edozi obodo na-eri n'ọnụ. M wee sị na a chọrọ m pati a na-ekwu eziokwu.

"Pati anyị bụ pati na-akwụdo na mmadụ niile bụ otu; onye nwere ego na onye enweghị ego bu otu."

Gee ihe o kwuru n'uju n'ihe onyonyo a;