"Na mbido ndị mmadụ achọghị ka m rụọrọ ha ekwentị maka na m bụ nwaanyị mana ha na-achọzi m achọ" - Doris Chiadikobi
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu, Kelechi Anozia na Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist, Video Journalist na Video Journalist
Nwada Doris Chiadikobi na-arụzi ekwentị akọwaala etu o siri malite nakwa ihe ndị ọ gabigara mgbe o bidoro njem aka ọrụ ahụ.
Nwada a e ji 'Grandma Phone' maara gwara BBC Igbo na o bidoro ịmụ ka e si arụ ekwentị mgbe ọ dị afọ iri na ise n'afọ 2001/2002 mgbe ekwentị a kpọrọ GSM batara na Naịjirịa.
Ọ sị na ọ banyere n'aka ọrụ a maka mmasị o nwere n'ihe banyere tekịnụzụ, tinyekwara na ekwentị abụghị ihe ga-ala n'oge dị nso.

O kwuru na ọ mụrụ ọrụ a ihe dịka afọ atọ ma malite ịrụzi ekwentị kama na nsogbu cheere ya aka mgba bụ na ọtụtụ ndị mmadụ anaghị ekwe enye ya ọrụ maka na ọ bụ nwaanyị.
"Mgbe m bidoro, enwere m nsogbu n'ịchọta ndị mmadụ ga-ekwe ka m rụọrọ ha ekwentị, m gwa ha na m na-arụ ekwentị, ha leecha m anya ha sị na abụ m nwata nwaanyị, na m gaghị arụnwu ekwentị.
"Mgbe ahụ ụfọdụ na-enye m ekwentị, m rụọrọ ha n'efu kama ka ọ bụrụ na m gosiri aka ọrụ m, mana taa ọ bụ ha na-achọzi m."


Chiadikobi kwuru na o so n'otu n'ime ndị malitere ịrụzi ekwentị na Naịjirịa maka na ọ rụọla ọrụ a ihe karịrị afọ iri abụọ (20yrs), kamgbe ekwentị pụtara na Naịjirịa rute ugbua.
O kwuru na ihe mere o jiri pụọ iche n'ọrụ maọbụ ka nọgide n'ọrụ a rute ugbua bụ maka na ọ na-eme nnyocha banyere tekịnụzụ ọgbara ọhụrụ nke ekwentị ji arụ ọrụ, tinyekwara na ọ na-azụ ọtụtụ ngwaọrụ e ji arụzi ekwentị.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ zụpụtala ọtụtụ ndị mmadụ n'ọrụ ịrụzi ekwentị nke gụnyere ọtụtụ ụmụnwaanyị na ndị ntoroọbịa, bụ ndị na-eme ọfụma n'ọrụ ha ugbua.
"Ihe mere m pụọ iche n'ọrụ a bụ na m na-eme nnyocha ọfụma ma na-azụkwa ngwaọrụ ọfụma.
"Azụpụtala m ọtụtụ narị ndị ntoroọbịa, ma ndị m zụrụ n'efu, ndị kwụrụ m obere ego nakwa ndị m ji ngwaọrụ duo ụlọ."
Kirie ihe o kwuru n'uju;