Mmasị m nwere n'ịbụ onyendu mere m jiri malite ịchịkọta ndị ọgba bọọlụ - Emeka Cavani
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu & Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist & Video Journalist
Nwata na-agba bọọlụ ma na-achịkọta ndị ọgba bọọlụ bụ Ozor Chukwuemeka Boniface akọwaala ihe kpalitere mmụọ ya n'ịchịkọta ndị ọgba bọọlụ.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Emeka bụ onye e ji Cavani maara kwuru na kamgbe ọ dị na nwata na o nwere mmasị ịbụ onyendu, na ọ bụ ihe mere o jiri malite ịchịkọta ndị ọgba bọọlụ.

O kwuru na ọ malitere ịgba bọọlụ bụ akaraka ya n'afọ 2019 mana ọ banyezie n'ịchịkọta ndị ọgba bọọlụ n'afọ 2024.
"Ebidoro m ịgba bọọlụ n'afọ 2019, ma bido n'ọnwa Novemba 2024 na-achịkọta ndị na-agba bọọlụ.
"Ihe mere m jiri malite ịchịkọta ndị ọgba bọọlụ bụ maka na m nwere mmasị ịbụ onyendu kamgbe m dị obere."
Ihe onyonyo mbụ Emeka mere ebe ọ na-achịkọta ndị ọgba bọọlụ wuru ewu na soshal midia nke mere onyeisi ndị otu Enugu Rangers jiri kpọọ ya ka ọ bịa soro ha na-agba bọọlụ.

Ugbua Emeka na-agbara ndị otu a bọọlụ n'okpuru afọ iri na atọ. Emeka na-agụkwa akwụkwọ, ọ sị na ọ nọ n'ogogo JSS1.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ onyeisi ndị otu Rangers na-azụ ya n'ụlọakwụkwọ maka etu o si eme ọfụma n'ịchịkọta ndị ọgba bọọlụ.
"N'ezie ana m agụụ akwụkwọ, anọ m n'ogogo JSS1.
"Ọ bụ onyeisi ndị otu Rangers Ezeaku Amaobi Paulinus na-azụ m n'ụlọ akwụkwọ."
O kwuru na ebumnobi ya bụ ịgba bọọlụ ọfụma ma ọ gụchaa akwụkwọ iji gosi nne na nna ya na ihe ọ na-eme doro ya anya.
Kirie ihe o kwuru n'uju;
