Esitere m n'usekwu m wube ụlọahịa a ma ama ugbua – Nelly Agbogu hibere Naija Brand Chick
- Onye dere ya, Donald Wogu na Michael Ngene
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist and Journalist
Nelly Agbogu, onye hibere ụlọọrụ Naija Brand Chick nakwa Nellies Health Food akọwaala etu o siri malite njem ya tinyere mbọ ọ na-agba ibelata ibu dị ya n'ahụ.
Nwaanyị ahụ bụ ọgbambọ kwuru na ya bidoro ụlọọrụ ya n'ime usekwu tupu ọ bụrụ onye nwere otu n'ime ụlọọrụ ndị kachasị ewu ewu na Naịjirịa.
Taa, ụlọọrụ ya na-enyere ndị na-emepụta ngwaahịa dị iche iche aka ka ha hụ ndị ga-azụ ha ahịa.
Oge ya na BBC News Igbo kparịtara ụka, Agbogu kọwara na ụlọọrụ ya bụ Nellies na-emepụta ma na-ere achịcha e ji akpụ mee a kpọrọ 'tapioca biscuits' tinyekwara 'ụgụ chips'.
O kwuru na ihe na-akpalite mmụọ ya imepụta ụdị ngwaahịa ndị a bụ iji gbaa ndị Naịjirịa ume ka ha malite iji nri ndị na-edozi ahụ dị na mba ahụ na-enweta onwe ha.

Gbasara Naija Brand Chick, Agbogu sịrị na ya malitere ịkụziri ndị mmadụ ka e si ekesa ngwaahịa ha ma gaakwa n'ihu ikepụta ohere ga-ejikọta ndị ahụ na-emepụta ngwaahịa na ndị na-azụ ha ahịa.
Ohere ahụ o kepụtara bụ nke a maara taa dịka Naija Brand Chick Trade Fair.
Kemgbe ọ malitere Naija Brand Chick Trade Fair, a haziela ya na Legọs, Imo, Kadụna, Enugwu nakwa Lọndọn.
O gosipụtara obiụtọ ya gbasara ezi mmetụta nke ihe omume ahụ nakwa etu o si agbanwe ndụ ụmụ mmadụ.
Agbogu gbara ndị na-ere ahịa ume, ọkachasị ụmụnwaanyị, ka ha malite ikwusa gbasara ngwaahịa ha ọ bụnadị tupu ha amalite ịzụta ngwaahịa ndị ha chọrọ ire.
Oge a jụrụ ya etu o si elekọta ezinaụlọ ya na azụmahịa ya, Agbogu kọwara na site na nkwado di ya, ọ na-enwe ike zute mkpa ezinaụlọ ya dị iche iche n'ụbọchị ma lebara azụmahịa ya anya n'oge abalị.

N'ịga n'ihu, Agbogu kọkwaara anyị mbọ ọ na-agba ibelata ibu nakwa etu o si adọghachi ya azụ kemgbe ọtụtụ afọ.
"Amaghị m na m buru ibu ruo oge m chọpụtara na arụ m bụ 210kg," ka Agbogu gwara BBC News Igbo.
"Amalitela m njem ọhụrụ iji belata arụ m ma bidokwa ịhụ ihe dị iche," ka o kwuru.
O kwuru na ya atụfuola arụ ruru 55kg mana ebumnobi ya bụ ka arụ ya bụrụ maọbụ ghara iru 100kg, bụkwanụ nke ọ na-agba mbọ ugbua inwetazu.
